21 lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị gị;+ m ga-ebibikwa gị+ ma bipụ onye ọ bụla bụ́ nwoke+ nke si n’ahụ́ Ehab na onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe n’Izrel.
26 ‘“N’ezie, ahụrụ m ọbara Nebọt+ na ọbara ụmụ+ ya ụnyaahụ,” ka Jehova kwuru, “m ga-akwụ gị ụgwọ+ n’ibé ala a,” ka Jehova kwuru.’ N’ihi ya, bulite ya; tụba ya n’ibé ala ahụ dị ka Jehova kwuru.”+