6 Jehova nwere mma agha. Ọ ga-ejupụta n’ọbara.+ A ga-eme ka o jupụta n’abụba, jupụtakwa n’ọbara ụmụ ebule na mkpi, na abụba+ si n’akụrụ ebule. N’ihi na Jehova nwere àjà ọ kwadebere na Bọzra, ọ ga-asụkwa ndị mmadụ akwụ n’ala Idọm.+
63Ònye bụ onye a si Idọm+ na-abịa, onye yi uwe tụrụ àgwà nke na-egbuke egbuke, onye si Bọzra+ na-abịa, onye a nke yi uwe dị ebube, onye ji ike ya dị ukwuu na-azọ ije?
“Ọ bụ m, Onye na-ekwu okwu n’ezi omume,+ Onye jupụtara n’ike nzọpụta.”+
13 “N’ihi na ejiriwo m onwe m ṅụọ iyi,”+ ka Jehova kwuru, “na ọ dịghị ihe ọzọ Bọzra+ ga-aghọ ma ọ bụghị ihe ijuanya,+ ihe nkọcha, ihe a lara n’iyi na ihe a bụrụ ọnụ; obodo ya niile ga-aghọkwa ebe a lara n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”+