39 “‘Ihe ndị a ka unu ga na-achụrụ Jehova n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu n’oge a kara aka,+ ma e wezụga onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu ga na-achụ n’àjà dị ka àjà nsure ọkụ+ unu na àjà ọka+ unu na àjà ihe ọṅụṅụ+ unu na àjà udo unu.’”+
6 Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà nsure ọkụ+ unu na àjà nkịtị unu na otu ụzọ n’ụzọ iri+ unu na onyinye unu na-eweta+ na onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu na anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi unu nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ+ unu.
10 Ị ga-emekwara Jehova bụ́ Chineke gị ememme izu,+ na-adabere n’onyinye afọ ofufo i ji bụ́ nke ị ga-enye, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie gị.+