14 “‘Ọ bụrụkwa na onye mbịarambịa bi n’etiti unu dị ka ọbịa, ya onwe ya kwa ga-akwadebe àjà ememme ngabiga a na-emere Jehova.+ Dị ka ụkpụrụ ememme ngabiga na usoro ya si dị ka ọ ga-eme ya.+ Otu ụkpụrụ ga-adịrị unu, ọ ga-adịrị ma onye mbịarambịa ma nwa afọ ala unu.’”+
27 N’ụbọchị ahụ, Jọshụa mere+ ha ndị na-akpatara nzukọ ahụ nkụ na ndị na-esetara ha mmiri.+ O mekwara ha ndị na-akpata nkụ na ndị na-eseta mmiri maka ebe ịchụàjà Jehova, ruo taa, n’ebe ọ bụla ọ họọrọ.+
6 “Ndị mba ọzọ, bụ́ ndị sonyeere Jehova iji jeere ya ozi+ na iji hụ aha Jehova n’anya,+ iji bụrụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izu ike ka ha ghara imerụ ya, ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike,+
27 Ya mere, o biliri gaa, ma, lee! otu ọnaozi+ Itiopia,+ nke nwere ike dị ukwuu n’okpuru Kandesi bụ́ eze nwaanyị ndị Itiopia, onye na-elekọta akụ̀ ya niile. Ọ gara Jeruselem ife Chineke,+