24 A na-emekwa ka unu mara na a gaghị ana ndị nchụàjà+ na ndị Livaị,+ ndị egwú,+ ndị nche ọnụ ụzọ,+ ndị Netinim,+ na ndị niile na-arụ ọrụ n’ụlọ Chineke nke a, ụtụ isi, ụtụ ahịa+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ.+
17 M wee nye ha iwu banyere Ido bụ́ onyeisi n’ebe a na-akpọ Kasifaya, m wee gwa ha ihe ha+ ga-agwa Ido na ụmụnne ya, bụ́ ndị Netinim,+ n’ebe a na-akpọ Kasifaya, ka ha kpọtara anyị ndị ga na-eje ozi+ n’ụlọ Chineke anyị.