16 Ị ga-emekwa ememme owuwe ihe ubi nke mkpụrụ mbụ kara aka+ nke ihe ị rụpụtara, n’ime ihe ị ghara n’ubi;+ nakwa ememme ịchịkọbata ihe ná ngwụsị afọ, mgbe i si n’ubi na-ewebata ihe ị rụpụtara.+
12 “‘N’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa+ ka unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla siri ike,+ unu ga-emekwara Jehova ememme ruo ụbọchị asaa.+