11 O wee ruo na ka ha si n’ihu Izrel na-agba ọsọ ma nọrọ ná mkpọda obodo Bet-horọn, Jehova mere ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé+ si n’eluigwe na-adagbu ha ruo Azika. Ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ gburu dị ọtụtụ karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha gbuo.
30 Jehova ga-eme ka a nụ olu ya dị ebube,+ meekwa ka a hụ+ ogwe aka ya nke na-aga ịdakwasị ndị iro ya, n’oké iwe+ nakwa n’ire ọkụ nke ọkụ na-erepịa ihe+ na oké mmiri ozuzo na oké ifufe mmiri+ na akụ́ mmiri ígwé.+