Job 35:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ha nọ n’ebe ahụ na-akpọku ya, ma ọ dịghị aza,+N’ihi nganga+ nke ndị ọjọọ. Abụ Ọma 18:41 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 41 Ha na-eti mkpu enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha,+Ha na-etiku Jehova, ma ọ dịghị aza ha.+ Ilu 28:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Onye na-ewepụ ntị ya ka ọ ghara ịnụ iwu+—ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.+ Jeremaya 11:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi+ nke ha na-enweghị ike isi n’ime ya pụta+ dakwasị ha; ha ga-akpọku m ka m nyere ha aka, ma agaghị m ege ha ntị.+ Jems 4:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Unu na-arịọ, ma unu adịghị arịọta, n’ihi na ihe mere unu ji na-arịọ ezighị ezi,+ ka unu wee mefuo ya n’agụụ ihe ụtọ anụ ahụ́ nke na-agụ unu.+
11 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi+ nke ha na-enweghị ike isi n’ime ya pụta+ dakwasị ha; ha ga-akpọku m ka m nyere ha aka, ma agaghị m ege ha ntị.+
3 Unu na-arịọ, ma unu adịghị arịọta, n’ihi na ihe mere unu ji na-arịọ ezighị ezi,+ ka unu wee mefuo ya n’agụụ ihe ụtọ anụ ahụ́ nke na-agụ unu.+