8 “‘Jọshụa, nnukwu onye nchụàjà, biko, nụrụ, gị na ndị ibe gị nọ ọdụ n’ihu gị, n’ihi na ha bụ ihe àmà;+ n’ihi na, lee, m na-akpọbata ohu m+ nke bụ́ Ome!+
34 Simiọn gọzikwara ha, gwakwa Meri bụ́ nne ya, sị: “Lee! E debere onye a ka ọ bụrụ ihe ga-akpata ọdịda+ na mbili nke ọtụtụ ndị n’Izrel+ nakwa ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama nke a ga-ekwutọ+
13 Ma mgbe ha hụrụ otú Pita na Jọn si nwee nkwuwa okwu, ghọtakwa na ha bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,+ o juru ha anya. Ha wee malite ịmata na ha na Jizọs na-anọbu;+
9 N’ihi na o yiri m ka Chineke edebewo anyị bụ́ ndịozi ịbụ ndị ikpeazụ n’ihe ngosi+ dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ,+ n’ihi na anyị aghọwo ihe nkiri n’ebe a na-eme ihe ngosi,+ n’anya ụwa, n’anya ndị mmụọ ozi,+ nakwa n’anya ụmụ mmadụ.+