Zekaraya
3 O wee gosi m Jọshụa+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà ka o guzo n’ihu mmụọ ozi Jehova, Setan+ guzokwa n’aka nri ya ka o guzogide+ ya. 2 Mmụọ ozi+ Jehova wee sị Setan: “Ka Jehova baara gị mba,+ Setan, ee, ka Jehova, bụ́ onye họọrọ Jeruselem,+ baara gị mba! Onye a ọ́ bụghị nkụ a lọpụtara n’ọkụ?”+
3 Ma Jọshụa yi uwe ruru unyi,+ o guzokwa n’ihu mmụọ ozi ahụ. 4 O wee gwa ndị guzo n’ihu ya, sị: “Yipụnụ ya uwe ahụ ruru unyi.” O wee sị ya: “Lee, agbagharawo m gị njehie gị,+ e yikwasịwokwa gị uwe ememme.”+
5 M wee sị: “Keenụ ya ákwà dị ọcha n’isi.”+ Ha wee kee ya ákwà dị ọcha n’isi, yikwasịkwa ya uwe mwụda; mmụọ ozi Jehova guzokwa n’akụkụ. 6 Mmụọ ozi Jehova wee malite ịgba Jọshụa ume, sị: 7 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije n’ụzọ m, ọ bụrụkwa na i debe ihe m nyere gị n’iwu,+ ọ bụ gị ga-ekpe ụlọ m ikpe,+ lekọtakwa ogige m; m ga-emekwa ka ị na-agakwuru ndị a guzo n’akụkụ ebe a mgbe ọ bụla ị chọrọ.’
8 “‘Jọshụa, nnukwu onye nchụàjà, biko, nụrụ, gị na ndị ibe gị nọ ọdụ n’ihu gị, n’ihi na ha bụ ihe àmà;+ n’ihi na, lee, m na-akpọbata ohu m+ nke bụ́ Ome!+ 9 N’ihi na, lee! m debere nkume+ n’ihu Jọshụa! Anya asaa dị n’elu nkume ahụ.+ Lee, m na-akanye ya akara,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘m ga-ewepụkwa njehie nke ala ahụ n’otu ụbọchị.’+
10 “‘N’ụbọchị ahụ,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘unu ga-akpọ ibe unu òkù, mgbe unu nọ n’okpuru osisi vaịn na n’okpuru osisi fig.’”+