27 Lee! Aha Jehova si n’ebe dị anya na-abịa, n’iwe ya na-ere ọkụ+ nakwa n’oké ígwé ojii. Egbugbere ọnụ ya jupụtara n’amamikpe, ire ya dịkwa ka ọkụ na-erepịa ihe.+
18 Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ụbọchị oké iwe Jehova;+ ma ọkụ nke ekworo ya ga-eripịa ụwa dum,+ n’ihi na ọ ga-ekpochapụ ndị niile bi n’ụwa, mkpochapụ ahụ ga-adịkwa nnọọ ukwuu.”+