8 Nke a bụ ihe ị ga-agwa ohu m Devid, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Mụ onwe m si n’ala ịta ahịhịa, n’ebe ị na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ,+ kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú+ nke ndị m Izrel.
34 Ma agaghị m anapụ alaeze ahụ dum n’aka ya, n’ihi na m ga-eme ka ọ bụrụ onyeisi ruo ụbọchị niile nke ndụ ya, n’ihi ohu m Devid bụ́ onye m họọrọ,+ n’ihi na o debere ihe ndị m nyere n’iwu nakwa ụkpụrụ m.
17 N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ọ dị ka “ụmụnna” ya n’ụzọ niile,+ ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere, nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi,+ ka o wee chụọ àjà ime udo+ maka mmehie nke ndị mmadụ.+