5 Jehova ga-emekwa ka e nwee ígwé ojii na anwụrụ ọkụ n’ehihie, na ìhè nke ọkụ na-enwu enwu+ n’abalị+ n’elu ebe niile guzosiri ike nke Ugwu Zayọn+ nakwa n’ebe a na-enwe mgbakọ na ya; n’ihi na a ga-enwe ihe mkpuchi iji chebe ebube ya dum.+
5 Dị ka nnụnụ nke na-efegharị si echebe ụmụ ya, otú ahụ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-echebe Jeruselem.+ Ọ ga-echebe ya, napụtakwa ya.+ Ọ ga-emere ya ebere, ọ ga-emekwa ka ọ lanahụ.”