6 O wee wute Devid nke ukwuu,+ n’ihi na ndị ahụ sịrị ka a tụọ ya nkume;+ n’ihi na ọ na-ewute ha niile ná mkpụrụ obi,+ onye nke ọ bụla n’ihi ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom. Devid wee jiri Jehova bụ́ Chineke ya na-eme onwe ya ka ọ dị ike.+
15 N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Site n’ịlọghachi na ịnọrọ nwayọọ, a ga-azọpụta unu. Unu ga-adị ike naanị site n’ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị m obi.”+ Ma unu achọghị.+