22 “Ruo ole mgbe ka unu ndị na-amaghị ihe ga na-ahụ amaghị ihe n’anya,+ ruokwa ole mgbe ka ihe doro anya na ọ bụ ịkwa emo ga na-agụ unu ndị na-akwa emo agụụ,+ ruokwa ole mgbe ka unu ndị nzuzu ga na-akpọ ihe ọmụma asị?+
20 N’ihi na àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya+ ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu,+ n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke,+ ya bụ, ike ebighị ebi ya+ na ịbụ Chineke ya,+ nke mere na ha enweghị ihe ngọpụ;+
21 n’ihi na, ọ bụ ezie na ha maara Chineke, ha enyeghị ya otuto dị ka Chineke, ha ekeleghịkwa ya,+ kama ha ghọrọ ndị na-enweghị nghọta,+ obi ha nke na-amaghị ihe gbakwara ọchịchịrị.+