6 Nwaanyị ahụ wee hụ na mkpụrụ osisi ahụ dị mma oriri nakwa na ọ na-agụsi anya agụụ ike, ee, osisi ahụ mara mma ile anya.+ O wee ghọrọ mkpụrụ ya rie. E mesịa, o nyetụrụ di ya mgbe ya na ya nọ, o wee rie.+
4 Ha wee sị: “Ngwanụ! Ka anyị wuoro onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe,+ ka anyị meekwara onwe anyị aha na-ewu ewu,+ ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.”+
13 ‘n’ihi na ndị m mere ihe abụọ dị njọ: Ha ahapụwo mụ onwe m,+ bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,+ ka ha wee gwuoro onwe ha olulu, olulu gbawara agbawa, ndị na-apụghị ichedo mmiri.’