13 Otu ụzọ n’ụzọ iri ka ga-anọ n’ime ya,+ ọ ga-aghọkwa ihe a ga-agba ọkụ ọzọ, dị ka osisi ukwu, dịkwa ka oké osisi, bụ́ ndị úkwù ha na-afọdụ+ ma e gbutuo ha;+ mkpụrụ dị nsọ ka úkwù ya ga-abụ.”+
6 “N’ihi ya, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Dị nnọọ ka osisi vaịn nke dị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa, bụ́ nke m tụnyeworo n’ọkụ ka ọ bụrụ nkụ, otú ahụ ka m meworo ndị bi na Jeruselem.+
6 Ọ bụrụ na onye ọ bụla anọgideghị n’ime m, a na-atụpụ ya dị ka alaka, ọ na-akpọnwụkwa; ndị mmadụ na-achịkọtakwa alaka ndị ahụ ma wụba ha n’ime ọkụ, ha ewee ree ọkụ.+