10 Unu aghọrọkwala mkpụrụ unu ghọfọrọ+ n’ubi vaịn unu, unu atụtụkọtala mkpụrụ vaịn dasasịrị n’ubi vaịn unu. Unu ga-ahapụ ha maka ndị nọ n’ahụhụ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
22 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi nke ala unu, unu ewerechala ihe dị n’ọnụ ọnụ ubi unu mgbe unu na-ewe ya, unu atụtụkọtala ihe unu wefọrọ n’ubi unu.+ Unu ga-ahapụ ha maka ndị nọ n’ahụhụ+ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”