4 Ma eleghị anya, Jehova bụ́ Chineke gị ga-anụ+ ihe niile Rabshake kwuru, onye eze Asiria onyenwe ya zitere ka ọ kwaa Chineke dị ndụ emo,+ ọ ga-emekwa ka ọ zaa ajụjụ maka okwu Jehova bụ́ Chineke gị nụrụ.+ Kpeekwa ekpere+ maka ndị fọdụrụnụ.’”+
17 O dekwara akwụkwọ ozi+ iji kọchaa Jehova bụ́ Chineke Izrel+ na iji kparịa ya, sị: “Dị ka chi dị iche iche+ nke mba ndị dị n’ala ndị ahụ na-anapụtaghị ndị ha n’aka m,+ otú ahụ ka Chineke Hezekaya na-agaghị anapụta ndị ya n’aka m.”