8 Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.+ Ọ ga-ewepụkwa n’ụwa dum nkọcha a na-akọcha ndị ya,+ n’ihi na Jehova ekwuwo ya.
19 Mgbe ndị nọ na Zayọn+ ga-ebiri na Jeruselem,+ ị gakwaghị akwa ákwá ma ọlị.+ Ọ ghaghị imere gị amara mgbe ọ nụrụ mkpu ákwá gị; ọ ga-aza gị ozugbo ọ nụrụ ya.+
10 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta,+ tirikwa mkpu ọṅụ bata na Zayọn;+ ha ga na-aṅụrịkwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ha ga-enwe obi ụtọ na ọṅụ, iru uju na ịsụ ude ga-agbafu.+
4 Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile+ n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ,+ iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.+ Ihe mbụ niile agabigawo.”+