10 “Ụmụ Izrel ga-adị ka ájá dị n’oké osimiri, bụ́ nke a na-apụghị ịtụ atụ̀ ma ọ bụ ịgụta ọnụ.+ Ọ ga-erukwa na n’ebe a na-asịbu ha, ‘Unu abụghị ndị m,’+ a ga-asị ha, ‘Unu bụ ụmụ nke Chineke dị ndụ.’+
11 “Ọtụtụ mba ga-esoro Jehova n’ụbọchị ahụ,+ ha ga-aghọkwa ndị m;+ m ga-ebikwa n’ime gị.” Ị ga-amatakwa na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute gị.+
10 N’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a, unu bụ ndị Chineke;+ unu bụbu ndị a na-emereghị ebere, ma ugbu a, unu bụ ndị e meere ebere.+