3 Ugbu a, ka anyị na Chineke anyị gbaa ndụ+ ịchụpụ+ ndị inyom ndị a niile na ụmụ ha dị ka ndụmọdụ Jehova sị dị, tinyere ndụmọdụ nke ndị na-ama jijiji+ n’ihe Chineke anyị nyere n’iwu,+ ka e wee mee ya otú iwu kwuru.+
2 “Ọ bụ aka m mere ihe a niile, nke mere ihe a niile ji dịrị,”+ ka Jehova kwuru. “Ọ bụ onye ihe na-enye nsogbu n’obi, onye nwere mwute na mmụọ ya,+ onye na-amakwa jijiji n’ihi okwu m+ ka m ga-elekwasị anya.
16 M nụrụ ihe ndị a, afọ wee gbarụọ m; mgbe m nụrụ ụda ya, egbugbere ọnụ m mara jijiji; ọkpụkpụ m wee rewe ure;+ m mara jijiji n’ebe m nọ, m ga-anọrọ nwayọọ wee chere ụbọchị ahụhụ,+ chere mgbe ọ ga-adakwasị ndị mmadụ,+ ka o wee wakpo ha.