33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
15 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’ilezi anya debe iwu ya niile na ụkpụrụ ya ndị m na-enye gị taa, nkọcha a niile ga-abịakwasị gị ma chụkwute gị:+
19 Eluigwe na ụwa bụ ndị akaebe m megide unu taa,+ na edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu,+ ngọzi+ na nkọcha;+ ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ,+ gị na ụmụ gị,+
9 Jehova adịghị egbu oge n’imezu nkwa ya,+ dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.+