26 ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+
34Unu mba dị iche iche, bịanụ nso nụrụ.+ Unu mba dị iche iche,+ geenụ ntị. Ka ụwa na ihe niile jupụtara n’ime ya ṅaa ntị,+ elu ala+ na ihe niile bi na ya.+
2 “Geenụ ntị, ndị dị iche iche, unu niile; ṅaa ntị, gị ụwa na ihe jupụtara n’ime gị,+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova bụrụ onye akaebe megide unu,+ ka Jehova si n’ụlọ ya dị nsọ gbagide unu akaebe.+