16 Manase wụfukwara ọbara na-emeghị ihe ọjọọ+ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu, ruo mgbe o mere ka Jeruselem ju n’ọnụ malite n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, n’agụnyeghị mmehie ya nke o ji mee ka Juda mehie site n’ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+
2 iji kwapụ ndị ogbenye n’okwu ikpe, napụkwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’etiti ndị m+ ikpe ziri ezi, ka ndị inyom di ha nwụrụ wee ghọọrọ ha ihe nkwata, ka ha wee bukọrọ ihe ụmụ na-enweghị nna!+
7 Ụkwụ ha na-agbaba naanị n’ihe ọjọọ,+ ha na-emekwa ngwa ngwa ịwụfu ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.+ Echiche ha bụ echiche ọjọọ.+ Ibukọrọ ihe mmadụ na itikpọ ihe mmadụ dịkwa n’okporo ụzọ ha.+
4 n’ihi na ha ahapụwo m,+ meekwa ka a ghara ịmatakwa ebe a,+ nọrọkwa n’ime ya na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ, bụ́ chi ha na ndị nna nna ha na ndị eze Juda na-amaghị;+ ha emewo ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta n’ebe a.+
35 ka ọbara ezi omume dum a wụfuru n’ụwa wee dị n’isi unu,+ malite n’ọbara onye ezi omume+ bụ́ Ebel+ ruo n’ọbara Zekaraya nwa Barakaya, onye unu gburu n’agbata ebe nsọ na ebe ịchụàjà.+