6 M wee jiri iwe na-azọda ndị dị iche iche n’ala. M wee mee ka ọnụma m na-egbu ha ka mmanya,+ meekwa ka ọbara nke na-agbapụta ha n’ahụ́ na-awụsa n’ala.”+
16 Ihere ga-eju gị afọ, ọ bụghị otuto.+ Gị onwe gị kwa ṅụọ ihe ọṅụṅụ,+ ka e werekwa gị dị ka onye a na-ebighị úgwù.+ Iko dị n’aka nri Jehova ga-abịara gị,+ ùgwù gị ga-akpụkwa n’ala;