48 Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru+ banyere Moab:+ “Ahụhụ ga-adịrị Nibo,+ n’ihi na e bukọrọwo ihe o nwere! E menyewo Kiriateyim+ ihere, e wegharawo ya. E menyewo ebe dị elu e wusiri ike ihere, e mewokwa ka oké ụjọ jide ya.+