8 Ókè ya gbagokwara ndagwurugwu nwa Hinọm,+ ruo ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs+ nke dị na ndịda, ya bụ, Jeruselem;+ ókè ya gbagoro n’elu ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu Hinọm n’ebe ọdịda anyanwụ, nke dị na nsọtụ ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu.
3 Ya onwe ya surekwara ihe nsure ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ sureekwa ụmụ ya ndị ikom+ n’ọkụ, dị ka ihe arụ+ nke mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel mere si dị.+
5 Ha wukwaara Bel ebe ndị dị elu ka ha wee na-esure ụmụ ha ndị ikom n’ọkụ ka ha bụrụ àjà a na-esurecha n’ọkụ nye Bel,+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu,+ nke m na-ekwuteghịkwa okwu ya, ọ bataghịkwa m n’obi.”’+