Jeremaya 14:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha ọ bụla, ụnwụ agaghịkwa ada n’ala unu, kama, m ga-eme ka unu nwee ezi udo n’ebe a.’”+ Jeremaya 23:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Ugboro ugboro ka ha na-asị ndị na-adịghị asọpụrụ m, ‘Jehova sịrị: “Udo ga-adịrị unu.”’+ Ha na-agwakwa onye ọ bụla nke na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ya si dị,+ sị, ‘Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị unu.’+ Jeremaya 27:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Unu egela ndị amụma ntị, bụ́ ndị na-asị unu, ‘Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi,’+ n’ihi na ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ Jeremaya 28:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘M ga-agbaji yok eze Babịlọn.+ Abụ Ákwá 2:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ndị amụma gị ahụwo ọhụụ ihe na-abaghị uru na ihe na-adịghị enye afọ ojuju,+Ha ekpugheghị njehie gị iji mee ka a ghara ịdọrọ gị n’agha,+Kama nke ahụ, ha nọ na-ahụtara gị okwu na-abaghị uru na nke na-eduhie eduhie n’ọhụụ.+
13 M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha ọ bụla, ụnwụ agaghịkwa ada n’ala unu, kama, m ga-eme ka unu nwee ezi udo n’ebe a.’”+
17 Ugboro ugboro ka ha na-asị ndị na-adịghị asọpụrụ m, ‘Jehova sịrị: “Udo ga-adịrị unu.”’+ Ha na-agwakwa onye ọ bụla nke na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ya si dị,+ sị, ‘Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị unu.’+
14 Unu egela ndị amụma ntị, bụ́ ndị na-asị unu, ‘Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi,’+ n’ihi na ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+
14 Ndị amụma gị ahụwo ọhụụ ihe na-abaghị uru na ihe na-adịghị enye afọ ojuju,+Ha ekpugheghị njehie gị iji mee ka a ghara ịdọrọ gị n’agha,+Kama nke ahụ, ha nọ na-ahụtara gị okwu na-abaghị uru na nke na-eduhie eduhie n’ọhụụ.+