8 Obi erughị ndị mmadụ ala.+ Ha nọ n’ihe mgbu, ime na-emekwa ha; ime na-eme ha dị ka nwaanyị nke na-amụ nwa.+ Ha kporopụrụ anya na-ele ibe ha. Ihu ha achagharịwo.+
3 Ọ bụ ya mere úkwù ji na-egbu m mgbu nke ukwuu.+ Anọ m n’ihe mgbu, dị ka ihe mgbu nke nwaanyị na-amụ nwa.+ Obi erughị m ala, n’ihi ya anaghị m anụ ihe; uche akpaghasịwo m, n’ihi ya anaghị m ahụ ụzọ.
22 Lee! Otu onye ga-efeli ma fedata n’ike dị ka ugo wee buru ihe,+ ọ ga-agbasakwa nku ya iburu Bọzra;+ n’ụbọchị ahụ, obi ndị dike nke Idọm ga-adị ka obi nwaanyị ime na-eme.”+
9 “Gịnịzi mere i ji na-eti mkpu n’oké olu?+ Ọ̀ bụ na e nweghị eze nọ n’ime gị, ka onye ndụmọdụ gị ọ̀ nwụwo, nke mere ahụ́ ji na-afụ gị ụfụ dị ka nwaanyị na-amụ nwa?+
3 Mgbe ọ bụla ha+ na-asị: “Udo+ na obi iru ala!” mgbe ahụ ka mbibi mberede+ ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe mgbu nke na-abịakwasị nwaanyị dị ime;+ ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.+