8 Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha n’iwu ka ha na-agbaso.+ Ha emeworo onwe ha ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ, na-akpọkwara ya isiala ma na-achụrụ ya àjà, na-asị, ‘Izrel, lee Chineke gị, onye dupụtara gị n’ala Ijipt.’”+
8 Ma ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama onye ọ bụla n’ime ha nọ na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ya si dị;+ m wee mee ka ihe niile e kwuru n’ọgbụgba ndụ a mezuo n’isi ha, bụ́ ihe m nyere ha n’iwu ka ha na-eme, ma ha emeghị ya.’”
8 “‘“Ha wee malite inupụrụ m isi,+ ha ekweghịkwa ige m ntị. Ha niile n’otu n’otu atụfughịkwa ihe arụ ha lekwasịrị anya, ha ahapụghịkwa arụsị Ijipt ndị na-asọ oyi ka nsị,+ m wee kwuo na m ga-awụkwasị ha ọnụma m, ka m wee wụkwasị ha iwe m dum n’ala Ijipt.+