7 “Cheta: Echefula otú i si kpasuo Jehova bụ́ Chineke gị iwe n’ala ịkpa.+ Malite n’ụbọchị i si n’ala Ijipt pụọ ruo mgbe unu bịarutere ebe a, unu anọwo na-enupụrụ Jehova isi site n’àgwà unu na-akpaso ya.+
23 n’ihi na nnupụisi+ na mmehie nke ịgba afa+ bụ otu ihe, iji mpako na-ebute ụzọ n’ihe na iji ike anwansi na terafim eme ihe bụ otu ihe.+ Ebe ọ bụ na ị jụwo okwu Jehova,+ ya onwe ya ajụwo gị ka ị ghara ịbụkwa eze.”+
26 “Otú ọ dị, ha ghọrọ ndị nnupụisi+ wee meere gị isi ike+ ma na-eleghara iwu gị anya,+ ha gbukwara ndị amụma gị,+ bụ́ ndị gbara àmà megide ha iji mee ka ha laghachikwute gị;+ ha wee na-eme omume nlelị dị ukwuu.+