33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
14 O wee dọrọ Jeruselem dum n’agha,+ tinyere ndị isi niile+ na ndị dimkpa niile bụ́ ndị dike+—puku mmadụ iri ka ọ dọọrọ n’agha—nakwa onye ọ bụla bụ́ omenkà+ na onye na-ewu mgbidi siri ike. Ọ dịghị onye a hapụrụ ma e wezụga ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha+ n’ime ndị ala ahụ.