19 Kwakọta ngwongwo ị ga-ebu mgbe a ga-adọrọ gị n’agha,+ gị ada+ bụ́ Ijipt, bụ́ nwaanyị bi n’ime ya. N’ihi na Nọf+ ga-aghọ ihe ijuanya, a ga-agbakwa ya ọkụ ka a ghara inwe onye bi ya.+
12 M ga-emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu n’etiti obodo ndị a lara n’iyi.+ Ruo afọ iri anọ, obodo ya niile ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu n’etiti obodo ndị a lara n’iyi.+ M ga-achụsasịkwa ndị Ijipt ná mba dị iche iche, meekwa ka ha gbasasịa n’etiti ala dị iche iche.”+
18 “Nwa nke mmadụ, kwaara ndị Ijipt ákwá arịrị, meekwa ka ha gbadaa,+ ha na ndị si ná mba ukwu dị iche iche, ee, ka ha gbadaa n’ime ala,+ ha na ndị na-agbada n’olulu.+