25 “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Mgbe m ga-akpọkọta ụlọ Izrel site n’etiti ndị dị iche iche bụ́ ebe a chụsasịrị ha,+ a ga-edokwa m nsọ n’etiti ha n’ihu mba dị iche iche.+ Ha ga-anọkwa n’ala ha+ nke m nyere ohu m Jekọb.+
25 Ha ga-ebikwa n’ala m nyere ohu m, ala m nyere Jekọb, bụ́ ebe nna nna unu hà biri,+ ha ga-ebikwa na ya,+ ha na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha ruo mgbe ebighị ebi.+ Ohu m Devid ga-abụkwa onyeisi ha ruo mgbe ebighị ebi.+