26 Ha ga-ebikwa na ya n’obi iru ala,+ wuokwa ụlọ+ ma kụọ ubi vaịn,+ ha ga-ebikwa n’obi iru ala+ mgbe m mere ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị niile na-akwa ha emo gburugburu ha;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova Chineke ha.”’”
14 M ga-etinye mmụọ m n’ime unu, unu ga-adịkwa ndụ ọzọ,+ m ga-emekwa ka unu biri n’ala unu; unu ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, meekwa ya,’ ka Jehova kwuru.”+