46 Ụlọ iri ihe nke chere ihu n’ebe ugwu bụ maka ndị nchụàjà bụ́ ndị na-arụ ọrụ a na-arụ n’ebe ịchụàjà.+ Ha bụ ụmụ Zedọk,+ ndị si n’agbụrụ Livaị, ndị na-abịaru Jehova nso ijere ya ozi.”+
15 “‘Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị,+ ụmụ Zedọk,+ ndị rụrụ ọrụ e kwesịrị ịrụ n’ebe nsọ m mgbe ụmụ Izrel si n’ebe m nọ kpafuo,+ ga-abịa n’ihu m jeere m ozi. Ha ga-eguzokwa n’ihu m+ na-eche abụba+ na ọbara+ n’ihu m,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.