5 Kọọnụ ya na Juda, kwusaakwanụ ya ọbụna na Jeruselem,+ kwupụtakwanụ ya, fụọkwanụ opi n’ala ahụ dum.+ Tienụ mkpu n’oké olu, sị: “Zukọtanụ, ka anyị banye n’obodo ndị e wusiri ike.+
6Gbaanụ ọsọ ndụ, unu ụmụ Benjamin, sinụ n’ime Jeruselem gbapụ; fụọkwanụ opi+ na Tekoa.+ Mụnyenụ ọkụ na Bet-hakirem+ ka ọ bụrụ ihe mgbaàmà; n’ihi na ọdachi, ee, oké mbibi, na-eru ka mmiri n’ebe ugwu.+