5 Ndị Ninive wee malite inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ,+ ha wee kpọsaa ibu ọnụ nakwa ka e yiri ákwà iru uju,+ malite n’onye kasị ukwuu n’ime ha ọbụna ruo n’onye kasị nta n’ime ha.
21 “Ahụhụ ga-adịrị gị, Korezin! Ahụhụ ga-adịrị gị, Betseida!+ n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ na Taya na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ dị ike ndị a rụrụ n’ime gị, ha gaara echegharị ogologo oge gara aga, yiri ákwà iru uju nọdụ ọdụ ná ntụ.+
41 Ndị ikom Ninive ga-ebili n’oge ikpe, ha na ọgbọ a,+ ha ga-amakwa ya ikpe;+ n’ihi na ha chegharịrị n’ihe Jona+ kwusara, ma, lee! e nwere onye ka Jona n’ebe a.
46 Pọl na Banabas wee kwuo okwu n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mkpa na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ebe ọ bụ na unu na-ajụ ya,+ ebe ọ bụkwa na unu na-ewere onwe unu ná ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, lee! anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+