22 Ọ bụ ya mere i ji dị ukwuu n’ezie,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova; n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ka gị,+ ọ dịghịkwa Chineke dịnụ ma e wezụga gị+ n’ime chi niile anyị jiworo ntị anyị nụ.
18 gị Onye na-egosi ọtụtụ puku mmadụ obiọma,*+ onye na-ewere ụgwọ njehie nke ndị bụ́ nna kwụọ ụmụ ha* ndị ga-anọchi ha,+ gị ezi Chineke, Onye ukwu,+ Dike,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha+ bụ aha gị,+