29 “Kpọkọọnụ ndị na-agba ụta, ndị niile na-ekwe ụta,+ ka ha buso Babịlọn agha. Maanụ ụlọikwuu gburugburu ya. Ka onye ọ bụla ghara isi na ya gbapụ.+ Kwụọnụ ya ụgwọ dị ka omume ya si dị.+ Meenụ ya dị ka ihe niile o mere si dị.+ N’ihi na ọ bụ Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel, ka o mesoro omume mpako.+