21 M wee kwuo ka e buo ọnụ n’ebe ahụ n’osimiri Aheva, ka anyị wee weda onwe anyị ala+ n’ihu Chineke anyị, iji rịọ ya ka o zi anyị ụzọ dị mma+ maka anyị na ụmụaka anyị+ na ngwongwo anyị niile.
3 N’ógbè niile dị iche iche,+ n’ebe ọ bụla okwu eze na iwu ya ruru, e nwere oké iru uju+ n’etiti ndị Juu, nakwa ibu ọnụ+ na ịkwa ákwà na mkpu arịrị. A gbasakwara ákwà iru uju,+ kposakwa ntụ+ ka ọ bụụrụ ọtụtụ ndị ihe ndina.
31 Ha ga-eme onwe ha ndị isi nkwọcha n’ihi gị,+ keekwa ákwà iru uju n’úkwù+ ma kwaara gị ákwá n’ihi ihe na-ewute ha ná mkpụrụ obi,+ na-akwa ákwá arịrị.