Abụ Ọma 9:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Ya onwe ya ga-ekpekwa elu ala ikpe n’ezi omume;+Ọ ga-ekpe mba dị iche iche ikpe ziri ezi.+ Abụ Ọma 31:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Jehova, agbabawo m n’ime gị.+Biko, ekwela ka ihere mee m ma ọlị.+Meere m ụzọ mgbapụ n’ihi ezi omume gị.+ Abụ Ọma 89:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze gị;+Obiọma na eziokwu na-abịa n’ihu gị.+ Aịzaya 26:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Agụụ gị agụsiwo mkpụrụ obi m ike n’abalị;+ ee, m na-achọsi gị ike n’ime mmụọ m;+ n’ihi na, mgbe ị na-ekpe ụwa ikpe,+ ọ bụ ezi omume+ ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.+
31 Jehova, agbabawo m n’ime gị.+Biko, ekwela ka ihere mee m ma ọlị.+Meere m ụzọ mgbapụ n’ihi ezi omume gị.+
9 Agụụ gị agụsiwo mkpụrụ obi m ike n’abalị;+ ee, m na-achọsi gị ike n’ime mmụọ m;+ n’ihi na, mgbe ị na-ekpe ụwa ikpe,+ ọ bụ ezi omume+ ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.+