22 M ga-emekwa ka ha bụrụ otu mba n’ala a,+ n’ugwu ndị dị n’Izrel, ọ bụkwa otu eze ka ha niile ga-enwe,+ ha agakwaghị abụ mba abụọ, a gakwaghị ekewa ha ka ha bụrụ alaeze abụọ.+
11 “‘N’ụbọchị ahụ, m ga-ebuli+ ụlọ ndò+ Devid nke dara ada,+ m ga-edozikwa ebe ndị a kwadara akwada. M ga-ewu mkpọmkpọ ebe ya, m ga-ewuli ya elu dị ka ọ dị n’ogologo oge gara aga,+
16 “‘Mụ onwe m, bụ́ Jizọs, zigara mmụọ ozi m ka ọ gbaara unu àmà banyere ihe ndị a maka ọgbakọ ndị a. Abụ m mgbọrọgwụ+ Devid, bụrụkwa nwa ya.+ Abụkwa m kpakpando ụtụtụ nke na-enwu gbaa.’”+