7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị agọziwo gị n’ihe niile aka gị na-eme.+ Ọ maara nke ọma banyere njegharị ị na-ejegharị ná nnukwu ala ịkpa a. Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị afọ iri anọ ndị a.+ Ọ dịghị ihe kọrọ gị.”’+
2 “Gaa jiri oké olu gwa Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Echetara m nke ọma obiọma* i nwere n’oge ị bụ nwa agbọghọ+ na ịhụnanya i nwere n’oge m kwere nkwa ịlụ gị,+ na otú i si na-eso m n’ala ịkpa, n’ala a na-aghaghị mkpụrụ ọ bụla.+