20 Ha wee bata ná mba dị iche iche ha batara. Ndị mmadụ wee na-emetọ aha nsọ m+ mgbe ha na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị Jehova, ọ bụkwa n’ala ya ka ha si pụta.’+
8 sitekwa n’ịrụnye ụzọ mbata ha n’ebe ụzọ mbata m dị, nakwa ịrụnye awara ụzọ ha n’akụkụ awara ụzọ m, ọ bụkwa naanị ahụ́ ụlọ dị n’etiti mụ na ha.+ Ha jikwa ihe arụ niile ha mere metọọ aha nsọ m,+ nke mere m ji were iwe kpochapụ ha.+