27 N’ihi ya, i nyefere ha n’aka ndị iro ha,+ bụ́ ndị nọ na-enye ha nsogbu;+ ma n’oge ha na-ata ahụhụ, ha na-etiku gị,+ gị onwe gị na-anọ n’eluigwe nụrụ;+ n’ihi ebere gị nke dị ukwuu,+ ị na-enye ha ndị nzọpụta,+ ndị na-azọpụta ha n’aka ndị iro ha.+
20 Ọ ga-abụkwara Jehova nke ụsụụ ndị agha ihe ịrịba ama na ihe akaebe n’ala Ijipt;+ n’ihi na ha ga-etiku Jehova n’ihi ndị na-emegbu ha.+ Ọ ga-ezigakwara ha onye nzọpụta, bụ́ onye ukwu, onye ga-anapụta ha.+