16 “M ga-achọ nke furu efu,+ ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka m ga-edughachite. M ga-eke ọkpụkpụ gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ahụ́ na-adịghị ike dịrị ike. Ma, m ga-ala nke mara abụba+ na nke dị ike n’iyi. M ga-eji ikpe nyejuo ya afọ.”+
19 Lee, n’oge ahụ, m ga-eme ihe megide ndị niile na-emekpa gị ahụ́;+ m ga-azọpụta onye na-ete ụkwụ,+ m ga-achịkọtakwa ndị a chụsara achụsa.+ M ga-emekwa ka ha nwee otuto na aha n’ala dum e mere ha ihe ihere.