1N’afọ mbụ nke ọchịchị Saịrọs+ eze Peshia, ka ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya+ wee mezuo, Jehova kpaliri+ mmụọ Saịrọs eze Peshia, o wee mee ka a kpọsaa+ n’ebe dum ọ na-achị, deekwa ya n’akwụkwọ,+ sị:
5 Ndị isi+ nke ndị bụ́ nna ndị Juda na nke ndị Benjamin, tinyere ndị nchụàjà na ndị Livaị, wee bilie, ya bụ, ndị niile mmụọ+ nke ezi Chineke kpaliri, ka ha lawa gaa wughachi ụlọ Jehova,+ nke dị na Jeruselem.
6 O wee sị m: “Nke a bụ ihe Jehova gwara Zerọbabel, ‘“Ọ bụghị site n’ụsụụ ndị agha,+ ọ bụghịkwa site n’ike,+ kama ọ bụ site na mmụọ m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.