10 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta,+ tirikwa mkpu ọṅụ bata na Zayọn;+ ha ga na-aṅụrịkwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ha ga-enwe obi ụtọ na ọṅụ, iru uju na ịsụ ude ga-agbafu.+
7 Unu ga-enweta òkè okpukpu abụọ kama ihere nke na-eme unu,+ ha ga-etikwa mkpu ọṅụ n’ihi òkè ha kama mmechuihu ha na-enwe.+ Ya mere, ha ga-enweta òkè okpukpu abụọ n’ala ha.+ Ha ga na-aṅụrị ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+